Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 7 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Epreel 2027

Wenezdee · Izu nke 2 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 2 nke Oge Ista

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Jọn Baptist de la Salle, Onye ụkọchukwu · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 5:17–26

17Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi. 18Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. 19Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị, 20“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.” 21Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe. Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha. 22Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ, 23“Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.” 24Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta. 25Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.” 26Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:1–8

1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.

Oziọma

Jọn 3:16–21

16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. 17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa. 18Ikpe amaghị onye ọbụla kwere na ya, ma onye ọbụla na-ekweghị aghọọlarị onye ikpe mara, nʼihi na o kweghị nʼaha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya. 19Nke a bụ mkpebi ikpe ahụ; na Ìhè abịala nʼụwa, ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị nʼanya kama ìhè ahụ, nʼihi na ọrụ ha jọrọ njọ. 20Nʼihi na onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwute ìhè ahụ, ka a ghara ime ka ọrụ ya pụta ìhè. 21Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike