Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 6 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 24 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Epreel 2027
Tiuzdee · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Forefeast of the Annunciation
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
1O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m; aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto, nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke, ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama, nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga. 2Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe; mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ; meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi, agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi. 3Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị. Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu. 4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba; ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha, ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo, na ndo nʼoge okpomọkụ. Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi, 5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara. Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị, dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ, otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị. 6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị, “Nke a bụ Chineke anyị nʼezie, anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị. Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi, ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
8Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị, 9“Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu, 10na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa. 11Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.” 12Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu. 13Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa. 14Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe, 15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ. 16Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.” 17Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
8Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya. 9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya. 10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere. 11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ. 12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto. 13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya. 14Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị. 15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ. 16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya. 17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha. 18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ. 19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide. 20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ. 21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu. 22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Mkpọsa)
10Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran. 11Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra. 12Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa. 13Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya. 14Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a. 15Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.” 16Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.” 17Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Mkpọsa)
27Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.” 44:1Mgbe ahụ, o mere ka m laghachi nʼụzọ, nʼọnụ ụzọ ama nke ebe nsọ ahụ, nke dị nʼezi, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, ma a gbachiri ya agbachi. 2Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Ọnụ ụzọ ama nke a ga-abụ ihe e mechiri emechi. A gaghị emeghe ya ọzọ, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi na ya bata. Nʼihi na Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel esitela na ya bata. Ya mere, ọ bụ ihe emechiri emechi. 3Naanị nwa eze, naanị ya onwe ya, bụ onye ga-anọdụ ala nʼime ya, iri nri nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ bata, ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-esi pụọ.” 4Mgbe ahụ, o mere ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼugwu, nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ. Elere m anya hụ na ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼihi ya, adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Mkpọsa)
1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. 2O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. 3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, 4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, 5“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. 6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” 7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. 8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. 10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. 11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Maachị na kalenda nzukọ bụ 6 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike