Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 8 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 26 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Epreel 2027

Tọọzdee · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Synaxis of the Archangel Gabriel

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 28:14–22

14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka. 15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” 16Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala. Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike. Onye nke kweere na ya egwu agaghị ejide ya. 17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu. 18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu. 19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji. 20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma. 21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim, ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. 22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 10:32–11:9

32Ndị a bụ ndị ikwu ụmụ Noa ndị ikom dịka usoro ọmụmụ ha si dị, dịka ha si biri na mba dị iche iche. Ọ bụ site na ndị a ka mba niile si gbasasịa ruo akụkụ niile nke ụwa mgbe uju mmiri ahụ gafechara. 11:1Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu. 2Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ. 3Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik, kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ. 4Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.” 5Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. 6Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime. 7Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.” 8Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. 9Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 13:19–14:6

19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị. 20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu. 21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume. 22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume. 23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya. 24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike. 25Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume. 14:1Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. 2Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 3Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 4Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 5Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 6Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Maachị na kalenda nzukọ bụ 8 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike