Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 29 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 16 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Maachị 2027
Mọnde · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Sabinus of Egypt († 287)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
13Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji. 14Ọ ga-abụkwa ebe nsọ; nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ ha nkume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ, oke nkume nke na-eme ka ha daa. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem igbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya. 15Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ; ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara. Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.” 16Kechie ihe ịgba ama nke iwu a kpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya. 17Aga m echere Onyenwe anyị, onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a. Aga m atụkwasị obi m na ya. 18Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Onyenwe anyị nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn. 19Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ? 20Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha. 21Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha. 22Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị. 9:1Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan. 2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị. 3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha. 4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
9Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya. 10Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet. 11Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. 12Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ. 13Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya. 14Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya. 15Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara. 16Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu. 17Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi. 18Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom. 19Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ. 20Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ. 21Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.” 22Noa mere ihe niile dịka Chineke nyere ya iwu ime.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu? Ọ bụ na nghọta anaghị eme ka olu ya daa ụda? 2Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile. 3Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu, 4ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu. 5Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta. 6Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi, 7Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị. 8Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya. 9Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi. 10Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.” 11Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya. 12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. 13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. 14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike. 15Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. 16Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. 17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. 18Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume. 19Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo. 20Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. 21Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Maachị na kalenda nzukọ bụ 29 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike