Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 29 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Maachị 2027
Mọnde · Ụbọchị asatọ nke Ista
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nʼime ụbọchị asatọ nke Ista
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. 22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ. 23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu. 24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya. 25Devid kwuru banyere ya, “ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile. Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m. Agaghị m ama jijiji. 26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ; anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya, 27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. 28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ; ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’ 29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa. 30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. 32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya. 33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ. 2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Oziọma
8Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya. 9Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya. 10Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.” 11Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere. 12Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego, 13sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’ 14Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.” 15Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike