Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 28 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 15 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 28 Maachị 2027
Sọnde · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 2 nke Lent Ukwu
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 10
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. 2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. 4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. 5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” 6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya. 7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. 9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. 10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” 11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. 12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. 13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. 14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
Akwụkwọ ozi
10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.” 13O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”? 14Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta? 2:1Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị. 2Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya. 3Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Gregori)
26Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. 8:1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.
Oziọma
1Mgbe ụbọchị ole na ole gafesịrị, ọ bataghachiri na Kapanọm. Ndị mmadụ nụrụ na ọ lọghachila. 2Igwe mmadụ zukọtara nʼime ụlọ ahụ nke mere na ohere afọdụghị ọ bụladị nʼọnụ ụzọ. O kwusakwaara ha oziọma. 3Ndị ikom ụfọdụ buteere ya otu nwoke ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ bụ mmadụ anọ bu ya. 4Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina. 5Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ha, ọ sịrị onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Nwa m nwoke, agbagharala gị mmehie gị.” 6Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu nọdụrụ ala nʼebe ahụ na-eche nʼime obi ha sị, 7“Gịnị mere onye a ji na-ekwulu Chineke? Onye pụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụghị naanị Chineke?” 8Ngwangwa Jisọs matara nʼime mmụọ ya na ha na-atule okwu a nʼime obi ha. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-eche ihe dị otu a nʼobi unu? 9Olee nke ka mfe: ọ bụ ịgwa onye a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ i sị, ‘Bilie chịrị ute gị jegharịa?’ 10Ma igosi unu na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, 11“Ana m asị gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị.” 12O biliri, chịrị ute ya pụọ nʼihu mmadụ niile. Nke a juru ndị niile nọ nʼebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
Oziọma (maka Onye nsọ Gregori)
9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke. 11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 15 Maachị na kalenda nzukọ bụ 28 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike