Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 30 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 17 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 30 Maachị 2027

Tiuzdee · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Alexis the Man of God († 411)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 9:9–10:4

9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị, 10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.” 11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha. 12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. 14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. 15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. 16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. 17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. 19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. 20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. 21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ. 10:1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi; ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu, 2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru ha nakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi, na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri ha na izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere. 3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile? 4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 7:1–5

1Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ. 2Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye, 3na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa. 4Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.” 5Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 8:32–9:11

32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. 33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. 34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; 35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ. 36Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.” 9:1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. 2O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. 3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, 4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, 5“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. 6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” 7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. 8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. 10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. 11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 17 Maachị na kalenda nzukọ bụ 30 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike