Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 27 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 14 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Maachị 2027

Satọdee · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee ncheta ndị nwụrụ anwụ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)

1Te 4:13–17

13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

Akwụkwọ ozi

Hib 3:12–16

12Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.” 16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)

Jọn 5:24–30

24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Oziọma

Mak 1:35–44

35Nʼisi ụtụtụ, mgbe ọchịchịrị ka gbachiri, o biliri, ga ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, naanị ya. Nʼebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere. 36Saimọn na ndị ya na ha nọ pụrụ na-achọgharị ya. 37Ma mgbe ha hụrụ ya, ha sịrị ya, “Mmadụ niile na-achọgharị gị!” 38Ọ zaghachiri ha sị, “Ka anyị gaanụ ebe ọzọ, nʼobodo ndị ọzọ dị anyị gburugburu, ka m zisakwaara ha oziọma. Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji bịa.” 39Ya mere, ọ pụrụ jegharịa na Galili niile na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere ha niile, na-achụpụkwa mmụọ ọjọọ. 40Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 41Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” 42Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. 43Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, 44ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Maachị na kalenda nzukọ bụ 27 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike