Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 8 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 23 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 8 Maachị 2027
Mọnde · Izu chiiz · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke Izu chiiz
Izu chiiz
Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu. 2Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma. 3Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ. 4O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu. 5Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke ị na-emere ụmụnna, ọ bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị. 6Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto. 7Ọ bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe. 8Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ. 9Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma. 10Ya mere, ọ bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile ọ na-eme na ọtụtụ ihe niile ọ na-ekwu megide anyị pụta ìhè. Ọ bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, ọ jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. Ọ na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ. 11Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye ọ bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya. 12Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs ọ bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. Ị makwaara na ọ bụ ezi ama ka anyị na-agba. 13Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha. 14Ọ bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu. 15Ka udo dịrị gị. Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.
Oziọma
29Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 30sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya. 31Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ” 32Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha. 33Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?” 34Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.” 35Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya. 36Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. 37Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.” 39Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!” 40Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.” 22:7O ruo nʼụbọchị Mmemme Achịcha na-ekoghị eko ahụ bụ ụbọchị a na-eji atụrụ Ngabiga achụ aja. 8O zipụrụ Pita na Jọn sị, “Gaanụ kwadoo maka oriri Ngabiga nke anyị ga-eri.” 9Ha sịrị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoo maka ya?” 10Ọ sịrị ha, “Lee, ka unu na-abata nʼobodo, otu nwoke bu ite mmiri ga-ezute unu, soronụ ya baa nʼụlọ ọbụla ọ banyere. 11Sịnụ onyenwe ụlọ ahụ, ‘Onye ozizi sịrị, Olee ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie oriri Ngabiga?’ 12Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu dị nʼelu ụlọ nke e dozicharala ihe niile, kwadoonụ nri anyị nʼebe ahụ.” 13Ha gara chọpụta ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ha kwadokwara nri Ngabiga ahụ. 14Mgbe oge awa ahụ ruru, ya na ndị na-eso ụzọ ya gara ebe ahụ nọdụ ala iri ihe. 15Ọ sịrị ha, “Ọ gụrụ m nnọọ agụụ ka mụ na unu rie nri Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ. 16Nʼihi na asị m unu, agaghị m erikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe a ga-emezu ya nʼalaeze Chineke.” 17O buru iko, mgbe o nyechara ekele ọ sịrị, “Burunu nke a kesaa nʼetiti unu. 18Nʼihi na asị m unu, site ugbu a ga nʼihu, agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, ruo mgbe alaeze Chineke ga-abịa.” 19O werekwara otu ogbe achịcha, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawaa ya nye ha sị, “Nke a bụ ahụ m nke e nyere nʼihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.” 20Nʼotu ụzọ ahụ, mgbe ha risiri nri anyasị o buuru iko sị, “Iko a bụ iko nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m, nke a na-awụpụ nʼihi unu. 21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri. 22Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.” 23Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a. 24Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya. 25Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ. 26Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi. 27Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu. 28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile. 29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya. 30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe. 31“Saimọn, Saimọn, lee ekwensu arịọla ike ịyọcha unu dị ka ọka wiiti. 32Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.” 33Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.” 34Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.” 35Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.” 36Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu. 37Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.” 38Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.” 39Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 8 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike