Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 7 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 22 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Maachị 2027
Sọnde · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde ịhapụ anụ
Sọnde nke Ikpe Ikpeazụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 7
1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha.
Akwụkwọ ozi
8Ma ọ bụghị nri ga-eme ka anyị na Chineke dị na mma. Ma anyị riri ma anyị erighị, ọ dịghị ihe ọhụrụ anyị ga-enweta. Ọ dịkwaghị ihe na-efunarị anyị. 9Ma lezienụ anya, otu o si dị, ka ike unu nwere ime ihe ọbụla dị unu mma, ghara ịghọ ihe ịsọ ngọngọ dịrị ndị na-adịghị ike nʼokwukwe ha. 10Nʼihi na ọ bụrụ na ndị ọzọ ahụ gị, gị onye nwere akọnuche, ka ị nọ, na-eri nri nʼụlọ arụsị, ọ bụ na ha agaghị eche na ha bụ ndị okwukwe ha na-esighị ike, ga-enwe obi ike soro gị rie nri a gọrọ arụsị? 11Nʼụzọ dị otu a, ndị kwere ekwe na-adịghị ike, ndị Kraịst nwụrụ nʼihi ha, na-esite nʼihe mmụta gị laa nʼiyi. 12Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, mgbe unu na-emegide mmụọ nwanne gị nʼime Kraịst, nʼihi nʼakọnuche ha esighị ike. 13Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya. 9:1Abụghị m onye nwe onwe ya? Abụghị m onyeozi Kraịst? Ọ bụ na m ahụghị Jisọs Onyenwe anyị? Unu abụghị ihe ngosipụta ọrụ m rụrụ nʼime Onyenwe anyị? 2Ọ bụrụ na m abụghị onyeozi nʼebe ndị ọzọ nọ, nʼebe unu nọ, abụ m onyeozi nʼeziokwu nʼihi na unu bụ akara nke ọrụ onyeozi m nʼime Onyenwe anyị.
Oziọma
31“Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. 32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. 33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya. 34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. 35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m. 36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’ 37“Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-ajụ ya sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? 38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe? 39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ 40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’ 41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. 42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. 43Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’ 44“Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, maọbụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, maọbụ oge ị bụ onye ọbịa, maọbụ oge ị gba ọtọ, maọbụ oge ị nọ nʼọrịa, maọbụ ị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ 45“Ọ ga-aza ha sị, ‘Eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nʼime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ i nyere aka.’ 46“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 22 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 7 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike