Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 8 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 8 Maachị 2027

Mọnde · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 4 nke Lent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Onye nsọ Jọn nke Chineke, Onye okpukpe · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 65:17–21

17“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa. 20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ. 21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 30:1, 3–5, 10–12

1Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka. 11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. 12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Oziọma

Jọn 4:43–54

43Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili. 44(Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.) 45Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ. 46Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. 47Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ. 48Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.” 49Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.” 50Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” 53Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere. 54Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike