Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 9 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 24 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 9 Maachị 2027

Tiuzdee · Izu chiiz · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke Izu chiiz

Izu chiiz

Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye bu ụzọ)

Aịz 40; Aịz 41; Aịz 45; Aịz 48; Aịz 54 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye bu ụzọ)

Mal 3; Mal 4 (amaokwu a họọrọ)

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye bu ụzọ)

Ọ dịghị na nsụgharị a

Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Onye bu ụzọ)

Luk 7:17–30

17Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu. 18Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?” 20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ” 21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. 22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma. 23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.” 29(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)

Akwụkwọ ozi

Jud 1:1–10

1Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a: 2Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba. 3Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe. 4Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. 5Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi. 6Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. 7Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. 8Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. 9Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.” 10Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)

2Kọ 4:6–15

6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. 12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu. 13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.

Oziọma

Luk 22:39–42, 45–23:1

39Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa. 40Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.” 41Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị, 42“Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.” 45Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi. 46Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.” 47Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ. 48Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?” 49Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?” 50Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. 51Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya. 52Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu? 53Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.” 54Mgbe ahụ ha jidere ya duru ya pụọ, gaa nʼụlọ onyeisi nchụaja. Pita sokwara ha nʼazụ kama ọ nọ nʼebe dị anya. 55Mgbe ha kwanyere ọkụ nʼetiti mbara ezi obi ahụ, ma nọdụ ala gba ọkụ ahụ gburugburu, Pita sokwara ha nọdụ ala. 56Ka ọ na-anya ọkụ ahụ, otu nwaagbọghọ na-eje ozi hụrụ ya, o leruru ya anya nke ọma, sị, “Onye a na Jisọs nọkọrọ.” 57Ma ọ gọrọ agọ sị, “Nwanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58Mgbe oge nta gasịrị, onye ọzọ hụkwara ya kwukwaa sị, “Gị onwe gị bụkwa otu onye nʼime ha.” Ma Pita kwuru sị, “Nwoke m, abụghị m.” 59Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.” 60Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa. 61Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” 62Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute. 63Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe. 64Ha jiri akwa kechie ya anya, sị ya, “Buo amụma, onye tiri gị ihe?” 65Ha kwukwara ọtụtụ okwu ọjọọ na nke mkparị megide ya. 66Mgbe chi bọrọ, nzukọ ndị okenye na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu zukọtara, a kpọtakwara Jisọs nʼihu ha. 67Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe. 68Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m. 69Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.” 70Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.” 71Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.” 23:1Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet.

Oziọma (maka Onye bu ụzọ)

Mat 11:2–15

2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya. 3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?” 4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 8Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze. 9Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma. 10Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 11Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 9 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike