Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 26 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke 2 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 2 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Obubu ọnụ na nchegharị
Izere anụ
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
3Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa. 4Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma. 12Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem. 13Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.” 17Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan. 18Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya. 19Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa! 20Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.” 21Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.” 22Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya. 23Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ. 24Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya. 25Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga. 26Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya? 27Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị. 28Mgbe ndị ahịa Midia ahụ rutere, ha sitere nʼolulu dọpụta Josef resi ya ndị Ishmel ahụ, ndị kwụrụ ụmụnne Josef iri mkpụrụ shekel ọlaọcha abụọ. Ha duuru Josef gaa Ijipt.
Abụ Ọma nzaghachi
16O zitere ụnwụ nʼala ahụ, bibie ụzọ niile ha si enweta ihe oriri; 17o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha, Josef, onye e refuru dịka ohu. 18Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ, nyanyekwa ya mkpọrọ igwe nʼolu, 19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu. 20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya. 21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
Oziọma
33“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35“Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40“Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ 43“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ. 45Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha. 46Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike