Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 27 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Febrụwarị 2027
Satọdee · Izu nke 2 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nke izu nke 2 nke Lent
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Gregori nke Narek, Onyeisi ndị mọnk na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
14Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie. 15“Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.” 18Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere. 19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri. 20Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. 12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
Oziọma
1Ugbu a, ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-abịa ya nso ịnụta ihe ọ na-ekwu. 2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.” 3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, 11O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ. 12Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere. 13“Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ. 14Mgbe o mefuchara ihe niile o nwere, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Ọ malitere ịnọ nʼụkọ. 15Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri. 16Ma ọ na-agụ ya ka o site na nri ọ na-enye ezi rijuo afọ, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ. 17“Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a. 18Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. 19Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’ 20Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ. 21“Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’ 22“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ. 23Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa. 24Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ. 25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu. 26Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme. 27Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’ 28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ. 29Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri. 30Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’ 31“Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị. 32Ma anyị kwesiri ịṅụrị ọṅụ, kpọọkwa oriri, nʼihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya. ’ ”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Gregori nke Narek, Onyeisi ndị mọnk na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike