Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 26 Febrụwarị
Kalenda Ọtọdọks · 13 Febụwarị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Febrụwarị 2027
Fraịdee · Izu nke Onye ọna ụtụ na Onye Farisii · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Martinian of Cæsarea in Palestine (c.422)
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
7Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya. 8Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta. 9Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a. 10Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ. 11Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì. 12Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya. 13Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ. 14Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ. 15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. 16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. 17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Oziọma
3Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi. 4Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a? 5A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike. 6Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ. 7Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya. 8O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya. 9Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 26 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike