Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 25 Febrụwarị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Febrụwarị 2027
Tọọzdee · Izu nke 2 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 2 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị. 7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. 8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.” 9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya? 10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 2Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Oziọma
19“Ọ dị otu ọgaranya na-eyi uwe odo odo na ezi akwa ọcha, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile. 20Nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, otu nwoke onye ogbenye nke ọnya juru ahụ ya na-edina nʼebe ahụ. Aha ya bụ Lazarọs. 21Ọ na-agụsị ya agụụ ike iri iberibe nri si na tebul ọgaranya ahụ daa nʼala. Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa na-aracha ọnya dị ya nʼahụ. 22“Mgbe onye ogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nʼebe Ebraham nọ. Onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. 23Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. 24Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’ 25“Ma Ebraham sịrị ya, ‘Nwa m, chetakwa na ị nara ezi ihe gị mgbe ị dị ndụ, ebe Lazarọs nara ihe ọjọọ. Ma ugbu a, a na-akasị ya obi nʼebe a ma gị onwe gị nọkwa nʼahụhụ. 26A sịkwarị na anyị achọọ inyere gị aka, ọ gaghị ekwe mee nʼihi na e nwere olulu dị ukwuu kewara anyị na unu. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike isite nʼebe a bịa nʼebe unu nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite nʼebe ahụ unu nọ bịa nʼebe a.’ 27“Ọ sịrị, ‘Ya mere, arịọ m gị nna, ziganụ ya nʼụlọ nna m, 28nʼihi na enwere m ụmụnne nwoke ise. Ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịbịa nʼebe a mmekpa ahụ dị.’ 29“Ebraham sịrị, ‘Ha nwere Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị.’ 30“Ma o kwuru, ‘Nna Ebraham, nke ahụ agaghị ezu! A sị na otu onye ga-esi nʼala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.’ 31“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha egeghị Mosis na ndị amụma ntị, ha agaghị ekwenye ma a sịkwarị na mmadụ esi nʼọnwụ bilie.’ ”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike