Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 5 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Ọgọọst 2027
Tọọzdee · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Tọọzdee nke izu nke 18 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Nraranye Basilika Onye nsọ Meri Ukwu · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ụmụ Izrel, bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara Zin nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na Kadesh. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Miriam nwụrụ. E lie ya. 2Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide Mosis na Erọn. 3Ha sesịrị Mosis okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị. 4Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke Onyenwe anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a? 5Gịnị mere i ji si nʼala Ijipt kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.” 6Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube Onyenwe anyị anya. 7Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 8“Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ Izrel niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.” 9Ya mere Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị weere mkpara ahụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere ya si dị. 10Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” 11Mgbe ahụ Mosis weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ Izrel niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri. 12Ma Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị Izrel niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.” 13A kpọrọ ebe ahụ mmiri Meriba, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Izrel wesoro Onyenwe anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya.
Abụ Ọma nzaghachi
1Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 8“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 9ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
Oziọma
13Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” 14Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 15Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” 16Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. 19Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.” 20Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ. 21Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie. 22Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!” 23Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike