Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 5 Ọgọọst

Kalenda Ọtọdọks · 23 Julaị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Ọgọọst 2027

Tọọzdee · Izu nke 7 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 5

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Trophymos, Theophilos and 13 others in Lycia (4th C)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Kọ 7:24–35

24Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke. 25Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi. 26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a. 27Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ. 28Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ. 29Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị. 30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla. 31Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga. 32Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ. 33Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ. 34Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ. 35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.

Oziọma

Mat 15:12–21

12Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwa na obi adịghị ndị Farisii mma nʼihi okwu ahụ i kwuru?” 13Ma ọ zara sị ha, “Osisi ọbụla Nna m nke eluigwe na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-ehopu. 14Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.” 15Pita sịrị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu a pụtara.” 16Ọ jụrụ ha sị, “Unu ọ ka dị ka ndị na-enweghị nghọta? 17Ọ bụ na unu aghọtaghị na ihe ọbụla nke na-aba nʼọnụ na-aga nʼime afọ, sịkwa nʼebe ahụ a nyụpụ ya nʼụlọ nsị? 18Ma ihe si mmadụ nʼọnụ pụta na-esi ya nʼobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. 19Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko niile, ịkwa iko nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwulu. 20Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupu o rie nri, maọbụ na ọ kwọghị.” 21Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Julaị na kalenda nzukọ bụ 5 Ọgọọst na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike