Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 6 Ọgọọst

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Ọgọọst 2027

Fraịdee · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mgbanwe Ọdịdị nke Onyenwe anyị

Mmemme · Agba ofufe: ọcha

Obubu ọnụ na nchegharị

Ụbọchị nchegharị

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Dan 7:9–10, 13–14

ma ọ bụ: 2Pt 1:16–19

9“Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. 10Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. 13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 97:1–2, 5–6, 9

1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ; ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu Onyenwe ụwa niile. 6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.

Oziọma

Mak 9:2–9

2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. 3Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha. 4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. 5Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.” 6(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.) 7Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.” 8Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs. 9Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike