Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Ọgọọst 2027 › 4 Ọgọọst
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Ọgọọst 2027
Wenezdee · Izu nke 18 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 18 nke Oge Nkịtị
Ncheta · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Jọn Vianney, Onye ụkọchukwu · Ncheta
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọnụ 13:1–2, 25–14:1, 26–30, 34–35
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Ziga ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa legharịa anya nʼala Kenan, ala ahụ m na-enye Izrel. Ziga mmadụ iri na abụọ, otu onyendu site nʼebo Izrel ọbụla.” 25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi. 26Ha lọtara bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel, na Kadesh nke dị nʼọzara Paran. Ndị nledo ahụ kọrọ akụkọ otu ha si gaa nʼọgbakọ ụmụ Izrel niile. Gosikwa mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 27Nke a bụ akụkọ ha kọọrọ Mosis, “Anyị ruru nʼala ahụ ị sị anyị gaa leta. Ọ bụkwa ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ndị a bụ mkpụrụ osisi si nʼala ahụ. 28Ma ndị bi nʼobodo ahụ siri ike. Obodo ha buru ibu bụrụkwa nke e wusiri ike. Anyị hụkwara ụmụ ụmụ Anak nʼebe ahụ. 29Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.” 30Ma Kaleb kwuru okwu mere ka obi sie ndị Izrel ike nʼoge a ha guzoro nʼihu Mosis sị ha, “Ka anyị gaanụ otu ihu nweta ala ahụ. Nʼihi na anyị nwere ike imeri ha.” 31Ma ndị nledo ahụ soro ya gaa zara sị, “Anyị enweghị ike ibu agha megide ndị a; ha dị ike karịa anyị.” 32Ndị a gbasara akụkọ ọjọọ nʼetiti ụmụ Izrel banyere ala ahụ ha gara ledoo. Ha sịrị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala na-eripịa ndị bi nʼime ya. Ndị niile anyị hụrụ nʼebe ahụ gbara nnọọ dimkpa 33Anyị hụrụ ndị Nefilim nʼebe ahụ (ndị bụ ụmụ ụmụ Anak, ndị sitere na ndị Nefilim). Nʼanya anyị, anyị dịka ụkpana nʼebe ha nọ, otu a ka anyị dịkwa nʼanya ha.” 14:1Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. 26Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị, 27“Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a. 28Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m. 29Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m. 30O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. 34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya. 35Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”
Abụ Ọma nzaghachi
6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. 7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. 13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè. 14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa. 21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt, 22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie. 23Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
Oziọma
21Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. 22Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile.” 23Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!” 24Ọ zara sị, “Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” 25Ma ọ bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nyere m aka!” 26Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.” 27Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.” 28Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Jọn Vianney, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike