Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 21 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 8 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 21 Jun 2027
Mọnde · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Ụbọchị Mmụọ Nsọ
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
8Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè 9(nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu). 10Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị. 11Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ. 12Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo. 13Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè. 14Nke a mere na e kwuru, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nʼọnwụ bilie. Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.” 15Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. 16Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ. 17Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee, 18Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ, 19werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ.
Oziọma
10“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nʼime ụmụntakịrị ndị a anya. Nʼihi na nʼeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nʼihu Nna m mgbe niile. 11Nʼihi na Nwa nke mmadụ bịara ịzọpụta ndị furu efu. 12“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu? 13Ọ bụrụkwa na ọ chọta ya, gịnị ka ọ ga-eme? Nʼezie, agwa m unu, ọ ga-aṅụrị oke ọnụ nʼihi otu atụrụ a karịa iri atụrụ itoolu na itoolu ndị ọzọ ahụ na-agahieghị ụzọ. 14Ya mere, ọ bụghị nzube Nna m nke bi nʼeluigwe ka otu nʼime ụmụnta ndị a ala nʼiyi. 15“Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jekwuru ya ebe naanị gị na ya nọ, tụọ ya mmehie nʼanya. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị nʼuru. 16Ma ọ bụrụ na o geghị gị ntị, kpọrọ otu onye maọbụ mmadụ abụọ ọzọ laghachi azụ nʼebe ọ nọ, ‘ka okwu ọbụla ekwuru bụrụ nke mmadụ abụọ maọbụ atọ ga-agba akaebe banyere ya.’ 17Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ndị chọọchị, ma ọ bụrụ na o geghịkwa ọ bụladị ndị chọọchị ntị, were ya dị ka onye mba ọzọ maọbụ onye ọna ụtụ. 18“Nʼezie, asị m unu, na ihe ọbụla unu kere agbụ nʼụwa a, e keela ya rịị agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla kwa unu tọpụrụ nʼụwa, a tọpụkwala ya rịị nʼeluigwe. 19“Ọzọ, ana m agwa unu nʼezie a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nʼetiti unu ekwekọrịta nʼụwa banyere ihe ọbụla unu na-arịọ nʼekpere Nna m bi nʼeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ. 20Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 8 Jun na kalenda nzukọ bụ 21 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike