Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 20 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Jun 2027
Sọnde · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 12 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: 8“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta, 9mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike, 10mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya, 11mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
Abụ Ọma nzaghachi
23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri. 24Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri. 25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu. 26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri. 28Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile. 29O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ. 30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo. 31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
14Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. 15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie. 16Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. 17Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.
Oziọma
35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” 36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” 39Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. 40Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” 41Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike