Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 6 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Jun 2027
Sọnde · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 10 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
9Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” 10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 2Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. 3O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 4Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 5Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 6Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 7Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 8Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke. 16Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị. 17Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. 18Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. 5:1Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe.
Oziọma
20Emesịa, ọ lọtara nʼụlọ, ma igwe mmadụ gbakọtakwara ọzọ nke mere na ha enweghị ohere iri nri. 21Mgbe ndị ikwu ya nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nʼụlọ ha, nʼihi na ndị mmadụ na-asị, “Isi adịghị ya mma.” 22Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “Mmụọ Belzebub bi nʼime ya! Ọ bụkwa nʼike onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.” 23Ma ọ kpọrọ ha jiri ilu gwa ha okwu sị, “Ekwensu ọ pụrụ ịchụpụ ekwensu? 24Ọ bụrụ na alaeze ekewa megide onwe ya alaeze ahụ apụghị iguzo. 25Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo. 26Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso. 27Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile. 28Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru. 29Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.” 30O kwuru nke a nʼihi na ha na-asị, “Mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya.” 31Mgbe ahụ, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke bịara, guzoro nʼezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya. 32Igwe mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ahụ gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị guzo nʼezi. Ha chọrọ ịhụ gị.” 33Ọ zara sị, “Onye bụ nne m, ndị ole bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 34Mgbe ahụ, o lere ndị nọ ya gburugburu anya ma sị, “Ndị a bụ nne m, na ụmụnne m ndị nwoke! 35Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Nobet, Bishọp
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike