Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 7 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 7 Jun 2027
Mọnde · Izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 10 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ: 2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. 4Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke. 5Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst. 6Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. 7Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
Oziọma
1Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, 2o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: 3“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 4Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. 5Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. 6Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. 7Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. 8Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. 9Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. 10Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. 11“Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. 12Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike