Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 6 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 24 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 6 Jun 2027
Sọnde · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 6 nke Ista
Sọnde nke Onye ìsì
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 8
11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
Akwụkwọ ozi
16Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga nʼụlọ ekpere, anyị zutere otu nwaagbọghọ bụ ohu, onye nwere mmụọ ịgba afa. Ọ na-ewetara ndị nwe ya ezigbo ego site nʼịgba afa. 17Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.” 18O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta. 19Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa. 20Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị, 21site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.” 22Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe. 23Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma. 24Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ. 25Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. 26Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. 27Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. 28Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!” 29Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. 30Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” 31Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” 32Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. 33Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. 34Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
Oziọma
1Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. 2Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?” 3Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. 4Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. 5Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.” 6Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. 7Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ. 8Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?” 9Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.” 10Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?” 11Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.” 12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.” 13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii. 14Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya. 15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.” 16Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha. 17Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.” 18Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya. 19Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?” 20Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya. 21Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.” 22Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nʼihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị kpebirila na ọ bụrụ na onye ọbụla ekwuo na Jisọs bụ Kraịst ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nʼụlọ ekpere ha. 23Nke a mere ndị mụrụ ya jiri sị, “Ọ bụ dimkpa, unu jụọ ya.” 24Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.” 25Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.” 26Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?” 27Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” 28Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis. 29Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.” 30Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m. 31Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya. 32Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. 33Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.” 34Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi. 35Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?” 36Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.” 37Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.” 38Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 24 Mee na kalenda nzukọ bụ 6 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike