Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 26 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 13 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Mee 2027

Wenezdee · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Etiti mmemme Pentikọọsụ

Ụbọchị obubu ọnụ

E kwere azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Mai 4:2–3, 5; 6:2–5, 8; 5:4–5

2Ọtụtụ mba ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta. 3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. 6:2“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka. 3“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m. 4Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka. 5Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.” 8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije? 5:4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa. 5Ọ ga-abụkwa udo anyị. Mgbe ndị Asịrịa ga-abata nʼala anyị nʼike, sikwa nʼebe niile e wusiri ike nke anyị na-agafe, anyị ga-ahọpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ọ bụladị ndịisi asatọ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Aịz 55:1; 12:3–4; 55:2–13

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. 12:3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 55:2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! 3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa. 4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama, ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche. 5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị, mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.” 6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya. Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso. 7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya, ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile. Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere, ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile. 8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile. 10Dịka mmiri na mkpụrụ mmiri si esi nʼeluigwe ada nʼụwa na-alaghachighị nʼeluigwe ma ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala, mee ka ihe ubi pupụta, too eto, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri. 11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya. 12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ, a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo. Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile nke ubi, ga-eti mkpu ọṅụ, kụọkwa aka nʼobi ụtọ. 13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya; ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya. Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu, nke ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 9:1–11

1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya nʼelu ogidi asaa. 2O doziela oriri ya nʼusoro, o gbuola anụ ya, gwaakwa mmanya. 3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile, site nʼebe dị elu nke obodo ka ha nọ na-akpọ oku na-asị, 4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche” Ma nye ndị amamihe kọrọ, ọ na-asị, 5“Bịanụ, rie nri m, ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. 6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ; gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” 7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. 8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị; baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. 10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. 11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị.

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 14:6–18

6Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ. 7Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ. 8Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla. 9O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya, 10were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije. 11Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.” 12Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu. 13Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha. 14Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu, 15na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha. 16Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha. 17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.” 18Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.

Oziọma

Jọn 7:14–30

14Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe. 15Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?” 16Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m. 17Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke. 18Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya. 19Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?” 20Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?” 21Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya. 22Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu. 23Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike? 24Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.” 25Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu? 26Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst? 27Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.” 28Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya. 29Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.” 30Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.

Akwụkwọ ozi (ngọzi mmiri)

Hib 2:11–18

11Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya. 12Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.” 13Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.” 14Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu. 15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile. 16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham. 17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile. 18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.

Oziọma (ngọzi mmiri)

Jọn 5:1–4

1Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. 2Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. 3Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. 4Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Mee na kalenda nzukọ bụ 26 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike