Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 25 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 12 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Mee 2027
Tiuzdee · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
St. Epiphanius the Bishop of Cyprus († 403)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
21Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?” 22Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.” 23Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa. Echi ya, o biliri soro ha gawa, ụfọdụ ndị kwere ekwe na Jopa sokwara ya gaa. 24Nʼụbọchị na-esota ya, ha bịaruru Sizaria. Kọnelịọs nọrịị na-eche ha, ya na ndị ezinaụlọ ya, na ndị ikwu na ibe ya, na ndị enyi ya ọ kpọrọ. 25Mgbe Pita batara, Kọnelịọs zutere ya, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọrọ ya isi nʼala. 26Ma Pita selitara ya elu sị, “Bilie ọtọ, mụ onwe m bụkwa mmadụ.” 27Mgbe ha na-ekwurịta okwu, ọ banyere nʼime ụlọ ma hụ igwe mmadụ ka ha zukọtara. 28Ọ sịrị ha, “Unu maara nke ọma na ọ bụ ihe megidere iwu na onye Juu na onye mba ọzọ ga-enwe mmekọrịta maọbụ gaa leta onye mba ọzọ. Ma Chineke ezila m na m ekwesighị ịkpọ mmadụ ọbụla onye rụrụ arụ maọbụ onye na-adịghị ọcha. 29Nʼihi nke a, ọ bụ ya mere m jiri bịa mgbe akpọrọ m na-ajụghị ajụjụ. Ma ka m jụọ ugbu a ihe mere unu ji kpọọ m?” 30Kọnelịọs sịrị, “Nʼụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nʼoge ehihie nʼụlọ m, nʼihe dịka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m nwoke yi uwe na-enwu ọcha ka o guzoro nʼihu m. 31Ọ sịrị, Kọnelịọs, ‘Chineke anụla ekpere gị ma chetakwa onyinye ị na-enye ndị ogbenye. 32Ziga nʼobodo Jopa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. O bi nʼakụkụ osimiri.’ Nʼebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye ọbịa aha ya bụ Saimọn a na-akpọ Pita. 33Ọ bụ nʼihi nke a ka m ji mee ngwangwa zie ka a kpọọ gị. Ọ dị mma na ị bịara. Ugbu a, anyị niile ezukọtala nʼebe a nʼihu Chineke ịnụrụ ihe niile Onyenwe anyị chọrọ ka ị gwa anyị.”
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. 2Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso, 3ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ. 4Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” 5Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya. 6Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile. 7Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ. 8Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.” 9Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili. 10Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo. 11Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?” 12E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.” 13Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Mee na kalenda nzukọ bụ 25 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike