Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 26 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Mee 2027

Wenezdee · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 8 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: ọcha

Onye nsọ Filip Neri, Onye ụkọchukwu · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 79:8–9, 11, 13

8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. 9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị. 11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. 13Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Oziọma

Mak 10:32–45

32Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya. 33Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ. 34Ha ga-akwa ya emo, gbụsakwa ya ọnụ mmiri asụ, pịa ya ihe ma gbukwaa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie.” 35Jemis na Jọn ụmụ Zebedi bịakwutere ya. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị chọrọ ka i meere anyị ihe ọbụla anyị rịọrọ.” 36Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 37Ha sịrị ya, “Kwere ka otu onye nʼime anyị nọrọ nʼaka nri gị, onye nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼime ebube gị.” 38Ma Jisọs sịrị ha, “Unu amataghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ mụ onwe m ga-aṅụ maọbụ bụrụ ndị a ga-eme ụdị baptizim a ga-eme m?” 39Ha zaghachiri ya, “Anyị pụrụ.” Jisọs sịrị ha, “Unu ga-aṅụ iko m ga-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim nke a ga-eme m. 40Ma ịnọdụ nʼaka nri m maọbụ nʼaka ekpe m abụghị ihe dịrị m inye, kama ọnọdụ ndị a dịịrị ndị a kwadooro ha.” 41Mgbe mmadụ iri ndị ọzọ nụrụ nke a, iwe jupụtara ha obi nʼihi Jemis na Jọn. 42Ma Jisọs kpọkọtara ha niile sị ha, “Dị ka unu onwe unu maara, ndị eze nke ndị mba ọzọ, na ndị a maara aha ha, na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. 43Ma nʼetiti unu ọ gaghị adị otu a. Kama onye ọbụla chọrọ ịdị ukwuu nʼetiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi. 44Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ onye mbụ nʼetiti unu, ga-abụ ohu mmadụ niile. 45Nʼihi na Nwa nke Mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi. Kama ka o jee ozi ma nyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta nke ọtụtụ mmadụ.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike