Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 27 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 14 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 27 Mee 2027

Tọọzdee · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Martyr Isidore of Chios

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 10:34–43

34Mgbe ahụ Pita meghere ọnụ ya sị, “Ugbu a, aghọtala m nʼezie na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya nʼihu. 35Kama nʼime mba ọbụla, onye ọbụla na-atụ egwu ya na onye na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata. 36Unu maara ihe banyere oziọma ahụ o zigaara ndị Izrel niile, nke na-akọ akụkọ oziọma nke udo site na Jisọs Kraịst onye bụ Onyenwe anyị nʼihe niile. 37Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya. 38Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya. 39“Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe. 40Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya. 41Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie. 42O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. 43Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”

Oziọma

Jọn 8:12–20

12Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” 13Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.” 14Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga. 15Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe. 16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m. 17E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ 18Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.” 19Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.” 20Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 14 Mee na kalenda nzukọ bụ 27 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike