Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 23 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 10 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Mee 2027
Sọnde · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 nke Ista
Sọnde nke Onye ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
21Ndị m hụrụ nʼanya, ọ bụrụ na obi anyị amaghị anyị ikpe, anyị nwere nkwuwa okwu nʼihu Chineke 22na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ. 23Nke a bụkwa iwu ya: ka anyị kwere nʼaha Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ya na ịhụrịta ibe anyị nʼanya dịka o nyere anyị nʼiwu. 24Ndị niile na-erube isi nye iwu ya na-anọgidesikwa ike nʼime ya, ya onwe ya na-anọgidesikwa ike nʼime ndị ahụ! Otu a ka anyị si mara na ọ na-anọgidesike nʼime anyị: Ọ bụ site na Mmụọ nke o nyere anyị. 4:1Ndị enyi m hụrụ nʼanya, unu ekwenyela okwu mmụọ niile, kama nwaleenụ mmụọ niile ahụ i mata ma ha si na Chineke, nʼihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụọla baa nʼime ụwa. 2Otu a ka unu ga-esi mata Mmụọ nke Chineke: Mmụọ ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs Kraịst abịala nʼanụ ahụ sitere na Chineke. 3Ma mmụọ ọbụla nke na-adịghị ekwupụta Jisọs esiteghị na Chineke, mmụọ dị otu a bụ nke onye ahụ na-emegide Kraịst nke unu nụrụ na ọ ga-abịa, ma ugbu a ọ bịala nʼụwa. 4Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa. 5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. 6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị. 13O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nʼime anyị igosi anyị na o bi nʼime anyị, na anyị bikwa nʼime ya. 14Ma anyị onwe anyị ahụla ma na-agbakwa ama na Nna ahụ zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta nke ụwa. 15Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke. 16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
20Onye ọbụla na-asị, “Ahụrụ m Chineke nʼanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nʼanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ pụghị ịhụ Chineke nʼanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya. 21Iwu o nyere anyị bụ, “Onye ọbụla hụrụ Chineke nʼanya aghakwaghị ịhụ nwanna ya nʼanya.” 5:1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 4
1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.
Akwụkwọ ozi
32Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida. 33Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ. 35Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị. 36Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ. 37Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu. 38Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.” 39Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ. 40Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala. 41O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ. 42A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Simiọn)
9Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m.
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. 2Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. 3Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. 4Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya. 5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. 6Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?” 7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.” 8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.” 9Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike. 10Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.” 11Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ” 12Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?” 13Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ. 14Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.” 15Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
Oziọma (maka Onye nsọ Simiọn)
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile? 55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom? 56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?” 57Iwe were ha nʼebe ọ nọ. Ma Jisọs gwara ha okwu sị ha, “A na-asọpụrụ onye amụma nʼebe niile, ma a dịghị asọpụrụ ya nʼobodo a mụrụ ya, nakwa nʼezinaụlọ nke ya.” 58Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Mee na kalenda nzukọ bụ 23 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike