Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 22 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 9 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 22 Mee 2027
Satọdee · Izu nke 3 nke Ista · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Isaiah (8th C BC)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe ụtụtụ: Oziọma (maka Onye nsọ Nikolas)
1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
Akwụkwọ ozi
19Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya. Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị. 20Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke. 21O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?” 22Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ. 23Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya. 24Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya. 25Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo. 26Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha. 27Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu. 28O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. 29Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya. 30Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs. 31Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Nikolas)
17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru. 18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile. 19Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. 20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, 21mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma
17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
Oziọma (maka Onye nsọ Nikolas)
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 9 Mee na kalenda nzukọ bụ 22 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike