Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 23 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Mee 2027
Sọnde · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Atọ nʼIme Otu Kachasị Nsọ
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
32Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla. 33O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? 34O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ? 39Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya. 40Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
Abụ Ọma nzaghachi
4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile. 5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ. 6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile. 9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm. 18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ. 19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ. 20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị. 22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
14Nʼihi na ndị niile Mmụọ nke Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. 15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.” 16Mmụọ Nsọ, nʼonwe ya na-agbakwa ama nʼime mmụọ anyị, na-agwa anyị na anyị bụ ụmụ Chineke. 17Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.
Oziọma
16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa. 17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ. 18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m. 19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. 20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike