Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 24 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 11 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Mee 2027
Mọnde · Izu nke 4 nke Ista · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Mocius the Presbyter of Amphipolis in Macedonia († c.295)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 11:1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri.
Akwụkwọ ozi
1Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọnelịọs. O bụ ọchịagha na-elekọta narị ndị agha si na mpaghara Itali. 2Nwoke a na ezinaụlọ ya bụ ndị na-asọpụrụ ma na-atụkwa egwu Chineke. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka na-ekpekwara Chineke mgbe niile. 3Otu ụbọchị, nʼihe dịka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ ebe otu mmụọ ozi nke Chineke bịakwutere ya sị ya, “Kọnelịọs!” 4Kọnelịọs lekwasịrị ya anya nʼegwu jụọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụ gịnị?” Ọ sịrị ya, “Ekpere gị na onyinye gị nye ndị ogbenye e rutela dịka ihe ncheta nʼihu Chineke. 5Ugbu a, zie ndị ikom ka ha gaa nʼobodo Jopa kpọta otu onye aha ya bụ Saimọn, onye a na-akpọkwa Pita. 6Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.” 7Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke. 8Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa. 9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. 10Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ. 11Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala. 12Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe. 13Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.” 14Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.” 15Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.” 16Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe.
Akwụkwọ ozi (maka ndị nsọ)
26Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. 27Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. 28Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. 8:1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.
Oziọma
56Onye ọbụla na-eri anụ ahụ m na-aṅụkwa ọbara m na-anọgide nʼime m mụ onwe m kwa nʼime ya. 57Dị ka Nna ahụ dị ndụ zitere m, ana m adịkwa ndụ nʼihi Nna ahụ, otu a ka onye na-eri m ga-adịkwa ndụ site na m. 58Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 59O kwuru ihe ndị a mgbe ọ na-akụzi ihe nʼụlọ ekpere dị na Kapanọm. 60Mgbe ọtụtụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya ha nụrụ nke a, ha sịrị, “Nke a bụ ozizi siri ike, onye nwere ike ịnabata ya?” 61Ebe Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu maka nke a ọ sịrị ha, “Nke a ọ na-ewute unu? 62Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ. 63Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ. 64Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye. 65Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.” 66Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya. 67Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?” 68Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. 69Anyị kweere marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”
Oziọma (maka ndị nsọ)
14“Unu bụ ihe nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nʼelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. 15Ndị mmadụ adịghị amụnye oriọna dọnye ya nʼokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba oriọna, ka o nye ndị niile nọ nʼụlọ ahụ ìhè. 16Ya mere, kwerenụ ka ìhè unu nwuo nye mmadụ niile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu nke bi nʼeluigwe. 17“Unu echela na m bịara ịkagbu iwu Mosis, maọbụ ozizi ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha. 18Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu. 19Nʼihi ya, onye ọbụla nke ga-emebi otu nʼime iwu ndị a, ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta, ma kuziekwara ndị ọzọ ime otu ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi ụmụ mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu ndị ahụ nʼonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nʼalaeze eluigwe.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Mee na kalenda nzukọ bụ 24 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike