Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 13 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 30 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Mee 2027
Tọọzdee · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Holy Apostle James Zebedee, brother of John the Theologian († 44)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Jemis)
1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ! 2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. 3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto. 4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu. 5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya. 6Ma rịọọ nʼokwukwe na-enweghị obi abụọ, nʼihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri oke osimiri mgbe ikuku na-ebugharị ya. 7Onye dị otu ahụ ekwesighị ile anya na ọ ga-esite nʼaka Onyenwe anyị nata ihe ọbụla. 8Nʼihi na mmadụ dị otu a bụ onye ihu abụọ, onye na-adịghị eguzo nʼotu ebe nʼihe ọbụla ọ na-eme. 9Ka nwanna ọbụla bụ ogbenye ṅụrịa ọṅụ, mgbe ọbụla e weliri ya elu. 10Ka onye bụ ọgaranya mgbe a na-eme ka ọ nọdụ ya dị ala, nʼihi na ndị bara ụba ga-akpọnwụ dị ka okoko osisi. 11Nʼihi na mgbe ọbụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahịhịa kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nʼala, mma ya agwụsịakwa. Nʼotu aka ahụ, onye ahụ bara ụba ga-akpọnwụ ọ bụladị mgbe ọ na-ejegharị nʼime ije ozi ya. 12Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Jemis)
13Ka onye ọbụla hapụ ị sị, mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke na-anwa m ọnwụnwa a.” Nʼihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ, ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọbụla ka o mee ihe ọjọọ. 14Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nʼọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya. 15Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ. 16Ekwela ka onye ọbụla duhie unu ụmụnna m. 17Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya. 18Nʼihi imezu nzube ya, o sitere nʼokwu ya bụ eziokwu mụọ anyị. O mekwara nke a ka anyị bụrụ ụmụ mbụ nke ihe o kere eke. 19Unu aghaghị icheta nke a ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya. Ka onye ọbụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu, ma bụrụkwa onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. 20Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. 21Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu. 22Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ naanị, na-arafu onwe ha, kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru. 23Nʼihi na onye ọbụla na-ege ntị nʼokwu ọbụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nʼenyo. 24O lesịa onwe ya pụọ, o chefuo ihe ihu ya yiri ma nwa oge nta gasịa. 25Ma nwoke ahụ nọgidesịrị ike na-ele anya nʼime iwu ahụ zuruoke, nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, ee, nwoke ahụ na-aga nʼihu ile na ime ihe iwu ahụ kwuru, hapụkwa ichefu ya, ka a ga-agọzi nʼihe niile ọ na-eme. 26Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka maọbụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru. 27Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke Nna anyị na-anabata dịka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị mmerụ, bụ nke a, ilekọta ndị na-enweghị nne na nna, na ndị di ha nwụrụ nʼime nsogbu ha na idebe onwe anyị nʼenweghị ntụpọ site nʼaka ndị ụwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ (maka Onye nsọ Jemis)
1Ụmụnna m, dịka ndị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye dị ebube, ka unu hapụ ile mmadụ anya nʼihu. 2Ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgbaaka ọlaedo na mkpịsịaka ya, abata nʼụlọ nzukọ unu, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, 3ọ bụrụ na unu elee onye ọgaranya ahụ yi uwe mara mma anya sị ya, “Bịa nọdụ nʼotu oche a e debere iche nʼihi gị,” ma unu asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, guzo nʼebe ahụ,” maọbụ “Bịa nọdụ ala nʼakụkụ ebe a ụkwụ m dị,” 4ọ bụ na unu akpabeghị oke nʼetiti onwe unu, bụrụkwa ndị ji ile anya nʼihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe? 5Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dịka ndị ogbenye, mee ka ha bụrụ ọgaranya site nʼokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nʼanya? 6Ma gịnị ka unu na-eme? Unu na-akparị ndị ogbenye! Ọ bụghị ndị ọgaranya na-emegbu unu? Ọ bụkwaghị ha bụ ndị na-adọkpụgharị unu aga nʼụlọikpe? 7Ọ bụghị ha bụ ndị na-ekwulu aha ọma ahụ nke a gụrụ unu? 8Ọ bụrụ na unu na-edebezuo iwu nke eze anyị dịka e dere ya nʼAkwụkwọ Nsọ, “Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya dịka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi. 9Ma ọ bụrụ na unu ele mmadụ anya nʼihu, unu na-eme mmehie. Nʼebe iwu dịkwa, unu bụ ndị na-emebi iwu. 10Nʼihi na onye ọbụla nke na-edebe iwu ahụ niile ma sụọ ngọngọ nʼotu, a bụrụla onye ikpe iwu ahụ niile maara. 11Nʼihi na onye ahụ sịrị, “Akwala iko,” bụkwa onye sịrị, “Egbula mmadụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị kwaghị iko ma i gburu mmadụ, ị bụ onye na-emebi iwu. 12Ya mere, na-ekwunu okwu, ma na-ebikwanụ ndụ dị ka ndị a ga-ekpe ikpe site nʼiwu ahụ na-eme ka mmadụ nwere onwe ha. 13Nʼihi na agaghị emere onye ọbụla ebere nke na-adịghị emere onye ọzọ ebere. Nʼihi na ebere na-adị ukwuu karịa ikpe ọmụma ya.
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.
Akwụkwọ ozi
23Mgbe ha hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị ibe ha ihe ndịisi nchụaja na ndị okenye gwara ha. 24Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile ji otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gị onwe gị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. 25Ọ bụ gị sitere nʼaka Mmụọ Nsọ site nʼọnụ nna anyị Devid, onye na-ejere gị ozi, sị: “ ‘Gịnị mere mba niile ji eme oke mkpọtụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru? 26Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha, ndị na-achị achị na-agbakọtakwa, imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.’ 27Nʼezie nʼobodo a, Herọd na Pọntiọs Pailet, na ndị mba ọzọ, nakwa ndị Izrel ezukọtala imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ Jisọs, onye i tere mmanụ, 28ha mere ihe i jiri ike gị na uche gị kwuo na ha aghaghị imezu. 29Ugbu a, Onyenwe anyị, lee ịba mba ha ma nye ndị ohu gị ike iji gbasaa ozi gị na-atụghị egwu ọbụla. 30Setịpụ aka gị gwọọ ndị ọrịa ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama site nʼaha onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi bụ Jisọs.” 31Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Jemis)
1Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha. 2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn. 3Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko. 4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị. 5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke. 6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche. 7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya. 8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.” 9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie. 10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
Oziọma
24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
Oziọma (maka Onye nsọ Jemis)
1Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. 2Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. 3Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe. 4Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.” 5Saimọn zara sị, “Nna anyị ukwuu, anyị rụsịrị ọrụ ike abalị niile na-egbutaghị ihe ọbụla, ma otu i sịrị kwuo, aga m awụnye ụgbụ azụ niile.” 6Mgbe ha mere nke a, ha gbutere ọtụtụ azụ nke mere na ụgbụ azụ ha malitere ịdọkasị. 7Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu. 8Ma mgbe Saimọn Pita hụrụ nke a, ọ dara nʼukwu Jisọs sị, “Si nʼebe m nọ pụọ, Onyenwe m, nʼihi na abụ m onye mmehie.” 9Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. 10Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.” 11Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 30 Epreel na kalenda nzukọ bụ 13 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike