Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 13 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 13 Mee 2027

Tọọzdee · Izu nke 7 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 7 nke Oge Ista

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha

Nne anyị nke Fatima · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 22:30; 23:6–11

30Nʼechi ya, ebe ọ chọrọ ịmata ihe bụ isi okwu na ihe mere ndị Juu ji ebo ya ebubo, o nyere iwu ka ndịisi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ, o dupụtara Pọl, mee ka o guzo nʼihu ha. 23:6Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” 7Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. 8Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile. 9Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” 10Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha. 11Nʼabalị ya, Onyenwe anyị bịakwutere ya sị, “Nwee obi ike, dịka i si gbaa ama banyere m na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwara m ama na Rom.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 16:1–2, 5, 7–11

1Abụ miktam nke Devid. Chebe m, O Chineke, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ. 2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Oziọma

Jọn 17:20–26

20“Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. 21Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m. 22Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; 23Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya. 24“Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa. 25“Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m. 26Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike