Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 12 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 29 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 12 Mee 2027
Wenezdee · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Nine Holy Martyrs of Cyzicus: Theognidus, Rufus, Antipater, Theostichus, Artemas, Magnus, Theodotus, Thaumasius, and Philemon († 286-299)
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
13Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ. 14Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a. 15Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a. 16Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a. 17Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.” 18Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs. 19Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị? 20Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” 21Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere. 22Nʼihi na nwoke a gwọrọ nʼụzọ dị ebube agafeela iri afọ anọ.
Oziọma
17Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.” 18Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara. 19Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa. 20Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a. 21Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ. 22Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. 23Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya. 24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 29 Epreel na kalenda nzukọ bụ 12 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike