Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 14 Mee
Kalenda Ọtọdọks · 1 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Mee 2027
Fraịdee · Izu nke 2 nke Ista · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Prophet Jeremiah (6th C BC)
Ụbọchị obubu ọnụ
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha. 2Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi. 3Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị? 4Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.” 5Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere. 6Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie. 7Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya. 8Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?” Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.” 9Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.” 10Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya. 11Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.
Oziọma
30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m. 31“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu. 32Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu. 33“Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ. 34Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu. 35Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta. 36“Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m. 37Ya bụ Nna ahụ zitere m na-agbakwa ama nʼonwe ya banyere m. Unu anụbeghị olu maọbụ hụ ụdịdị ya. 38Okwu ya anọkwaghị nʼime unu nʼihi na unu ekweghị nʼonye o zitere. 39Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. 40Ma unu jụrụ ịbịakwute m ka unu nwee ndụ. 41“Anaghị m anabata otuto nke ụmụ mmadụ. 42Ma amatara m na unu enweghị ịhụnanya Chineke nʼobi unu. 43Abịala m nʼaha Nna m ma unu anabataghị m. Ma ọ bụrụ na onye ọzọ abịa nʼaha nke onwe ya, unu ga-anabata ya. 44Olee otu unu ga-esi kwere ebe unu na-anara otuto site nʼaka ibe unu, ma unu adịghị achọ otuto nke si nʼaka onye naanị ya bụ Chineke? 45“Unu echela na m ga-ebo unu ebubo nʼihu Nna ahụ. Onye ga-ebo unu ebubo bụ Mosis, bụ onye unu tụkwasịrị obi na ya. 46Ọ bụrụ na unu kwenyeere Mosis, unu gakwara ekwere na m, nʼihi na o dere banyere m. 47Ma ebe unu na-ekweghị nʼihe o dere, olee otu unu ga-esi kwere nʼihe m kwuru?” 6:1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gafere nʼofe nke ọzọ nke osimiri Galili (nke a na-akpọkwa osimiri Tiberịas). 2Oke igwe mmadụ sooro ya, nʼihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ na-arụ nʼahụ ndị ọrịa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Mee na kalenda nzukọ bụ 14 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike