Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 3 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Epreel 2027
Satọdee · Ụbọchị asatọ nke Ista
Mmemme na ndị nsọ
Satọdee nʼime ụbọchị asatọ nke Ista
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
13Mgbe ha hụrụ nkwuwa okwu Pita na Jọn, na-atụghị ụjọ, ma chọpụtakwa na ha bụ ndị mmadụ nkịtị, na ndị a na-azụghị nʼụlọ akwụkwọ, o juru ha anya. Ma ha ghọtara na ha bụ ndị ha na Jisọs nọkọrọ. 14Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a. 15Ha nyere iwu ka ha si nʼụlọikpe ahụ pụọ, ma bido ịgba izu nʼetiti onwe ha banyere nke a. 16Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ agọ na ha rụrụ ọrụ ịrịbama pụrụ iche. Ndị niile bi na Jerusalem maara ihe banyere nke a. 17Ma iji mee ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla okwu banyere aha nwoke a.” 18Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs. 19Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị? 20Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” 21Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.
Abụ Ọma nzaghachi
1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 14Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m. 15Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! 16Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” 18Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. 19Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele. 20Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. 21Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m.
Oziọma
9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa. 10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ. 11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị. 12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo. 13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị. 14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite. 15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike