Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 4 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Epreel 2027
Sọnde · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke abụọ nke Ista (Sọnde Ebere Chineke)
Sọnde · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
32Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere. 33Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba. 34O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha, 35nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị.
Abụ Ọma nzaghachi
2Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 3Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 4Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 16Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” 17Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ. 18Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. 22Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; 23nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. 24Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Onye ọbụla kweere na Jisọs bụ Kraịst bụ onye amụrụ site na Chineke. Onye ọbụla nke hụkwara Nna nʼanya na-ahụkwa Ọkpara ya nʼanya. 2Ọ bụ otu a ka anyị si amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke nʼanya, mgbe anyị na-ahụ Chineke nʼanya, na-erubekwa isi nʼiwu ya niile. 3Nke a bụ ịhụnanya Chineke, na anyị ga-edebe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. 4Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. 5Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke? 6Ọ bụ onye ahụ bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ Jisọs Kraịst. O siteghị naanị na mmiri bịa, kama o sitere na mmiri na ọbara. Ọ bụkwa Mmụọ Nsọ na-agba ama maka ya, nʼihi na Mmụọ Nsọ bụ eziokwu.
Oziọma
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Isidọ, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike