Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 3 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 21 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 3 Epreel 2027

Satọdee · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee ncheta ndị nwụrụ anwụ

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ: ya na mmanụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi (maka ndị nwụrụ anwụ)

1Te 4:13–17

13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

Akwụkwọ ozi

Hib 10:32–38

32Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara. 33Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso. 34Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide. 35Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. 36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa. 37Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.” 38Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”

Oziọma (maka ndị nwụrụ anwụ)

Jọn 5:24–30

24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Oziọma

Mak 2:14–17

14Mgbe ọ na-aga nʼihu, ọ hụrụ Livayị nwa Alfiọs ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m,” o biliri sooro ya. 15Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ. 16Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?” 17Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị ha, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume kama ndị mmehie.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Maachị na kalenda nzukọ bụ 3 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike