Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 2 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Epreel 2027

Fraịdee · Ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nʼime ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 4:1–12

1Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha. 2Ha were oke iwe nʼihi na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa na nʼime Jisọs ka mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị. 3Ha jidere ha tinye ha nʼụlọ mkpọrọ, ruo nʼechi ya. Nʼihi na oge e jidere ha bụ nʼoge uhuruchi. 4Ma ọtụtụ ndị nụrụ okwu ahụ kwenyere. Ọnụọgụgụ ha ruru ihe dị ka puku mmadụ ise. 5Nʼechi ya, ndị na-achị achị, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ na Jerusalem. 6Onyeisi nchụaja bụ Anas nọ nʼebe ahụ, na Kaịfas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja. 7Mgbe ha kpọpụtara ha nʼetiti ha, ha jụrụ ha, “Ọ bụ site nʼike onye, na site nʼaha onye, ka unu ji mee ihe a?” 8Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye. 9Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya, 10ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ. 11Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’ 12Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 118:1–2, 4, 22–27

1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 4Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 22Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; 23nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. 24Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya. 25O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma. 26Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị. 27Onyenwe anyị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja.

Oziọma

Jọn 21:1–14

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. 2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla. 4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs. 5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?” Ha zara ya, “Mba.” 6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya. 7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. 9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha. 10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” 11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. 12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. 13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. 14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike