Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 25 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 12 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Maachị 2027
Tọọzdee · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Theophanes the Confessor of Sigriane († 818)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
1Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya. 2Ndị na-erugharị nʼelu ocheeze ya bụ ndị mmụọ ozi a na-akpọ seraf, ndị nwere nku isii. Ha ji nku ha abụọ kpuchie ihu ha; abụọ ka ha ji kpuchie ụkwụ ha, abụọ nke fọdụrụ ka ha ji na-efegharị. 3Ha na-abụrịtara onwe ha abụ, sị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile dị. Ụwa niile jupụtara nʼebube ya.” 4Nʼihi ụda olu ha, ọnụ ụzọ na mgbidi ụlọnsọ mara jijiji, ụlọ ahụ jupụtara nʼanwụrụ ọkụ. 5Etiri m mkpu akwa sị. “Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ, nʼihi na onye mmehie ka m bụ, egbugbere ọnụ m bụ egbugbere ọnụ rụrụ arụ; ọ bụkwa nʼetiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m bi. Ugbu a, ejirila m anya m hụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Eze ukwu ahụ!” 6Mgbe ahụ, otu nʼime seraf ndị ahụ sitere nʼebe ọ nọ fekwute m, were mkpa gụta otu icheku dị ọkụ site nʼebe ịchụ aja. 7O weere icheku ọkụ ahụ sọtụ m nʼọnụ, sị m, “Ugbu a, a gụọla gị dịka onye dị ọcha, nʼihi na icheku a emetụla gị nʼọnụ. A gbagharakwala gị mmehie gị niile.” 8Mgbe ahụ, anụrụ m olu Onyenwe anyị ka ọ na-ajụ, “Onye ka m ga-eziga? Onye ga-ejekwara anyị?” Asịrị m, “Lee m, ziga m.” 9Ọ siri, “Gaa gwa ndị a sị, “ ‘Na-anụnụ, ma unu aghọtala, na-elenụ anya ma unu ahụla.’ 10Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.” 11Ma ekwuru m sị, “Onyenwe m, ọ bụ ruo ole mgbe?” Ọ zara, “Ọ bụ ruo mgbe obodo ha tọgbọrọ nʼefu, mgbe ọ na-adịghị onye ga-afọdụ nʼime ya; mgbe ụlọ obibi ha niile ga-atọgbọrọ nʼefu, mgbe e bibisịrị ala ubi ha niile. 12Ọ bụ ruo mgbe Onyenwe anyị zigara onye ọbụla gaa ebe dị anya, ala niile atọgbọkwara nʼefu.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam. Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke. 2O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ. 3Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set. 4Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 5Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ. 6Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh, 7Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 8Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ. 9Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan. 10Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 11Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise. 12Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel. 13Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 14Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri. 15Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared. 16Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 17Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise. 18Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk. 19Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 20Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ. 21Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela. 22Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 23Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. 24Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla. 4Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. 5Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya. 6Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. 7Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, 8ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi. 9Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? 10Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, 11ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe. 12Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ, 13onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe. 14Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile. 15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya. 16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. 17Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. 18Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe, 19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna. 20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Maachị na kalenda nzukọ bụ 25 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike