Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 24 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 11 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Maachị 2027

Wenezdee · Izu nke 2 nke Lent Ukwu · Olu 1

Mmemme na ndị nsọ

Holy Hierarch Sophronius the Patriarch of Jerusalem (638-644)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 5:16–25

16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya, Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya. 17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ, ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ. 18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha; ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala. 19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa; ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ, ka anyị hụ ya. Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel, ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè, ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.” 20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ, ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ, na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu. 21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta. 22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya, na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya, 23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị, ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ. 24Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka, na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu, otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu; nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere, lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel. 25Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya; o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala. Ugwu niile ga-ama jijiji, ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 4:16–26

16Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden. 17Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke. 18Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek. 19Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila. 20Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu. 21Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi. 22Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama. 23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. 24Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” 25Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.” 26Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 5:15–6:3

15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị; mmiri dị mma nke si nʼolulu mmiri gị. 16Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ, ka mmiri nke aka gị sọọ nʼama? 17Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị, nke onye ọbịa na-agaghị enwe oke nʼime ya. 18Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị; ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị. 19Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma, ka ara dị ya nʼobi zuore gị, ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla. 20Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko? Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi? 21Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya, ihe niile ị na-eme ka ọ na-ahụ. 22Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi; mmehie ndị a bụ ụdọ nke na-ejide ya. 23Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị; ọ bụkwa nzuzu ya dufuru ya. 6:1Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe, ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, 2ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. 3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Maachị na kalenda nzukọ bụ 24 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike