Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 16 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 3 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 16 Maachị 2027

Tiuzdee · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

Martyrs Eutropius, Cleonicus and Basiliscus of Amasea († c. 308)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 1:19–2:3

19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya. 21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ. 22Ọlaọcha gị aghọọla unyi, ezi mmanya gị aghọọla nke a gwafere mmiri oke. 23Ndị ndu gị niile bụ ndị nnupu isi, ndị bụkwa ndị enyi ndị ohi, onye ọbụla nʼime ha hụrụ iri ngarị nʼanya, na-agbasokwa onyinye. Ha adịghị echebe ndị na-enweghị nna ikpe gbasara ndị inyom di ha nwụrụ adịghị abịa nʼihu ha. 24Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Onye dị ike nke Izrel, kwubiri sị, “Aga m abọ ọbọ megide ndị iro m, ime ka unu gharakwa inye m nsogbu ọzọ. 25Aka m ga-abịakwasị unu. Aga m anụcha unu dịka e si anụcha ọlaedo, si otu a wepụchaa unyi niile dị nʼime unu. 26Emesịa, aga m enye unu ndị na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị na-adụ unu ọdụ ga-abụkwa ndị nwere uche dịka ndị unu nwere na mbụ. Ọzọ, a ga-akpọ obodo unu Obodo Ezi Omume, Obodo kwesiri Ntụkwasị Obi.” 27A ga-eji ikpe ziri ezi zọpụta Zayọn. Ọ ga-ejikwa ezi omume zọpụta ndị niile lọghachikwutere ya. 28Ma ndị mmehie niile na ndị niile na-enupu isi ka ọ ga-ala nʼiyi; ọ ga-egbukwa ndị niile na-agbakụta Onyenwe anyị azụ. 29“Ihere ga-eme unu nʼihi osisi ook nsọ ndị ahụ niile obi unu na-enwe aṅụrị nʼime ha. Ihere ga-eme unu nʼihi ubi a gbara ogige ndị ahụ unu jiri aka unu họrọ. 30Unu ga-ala nʼiyi dịka osisi ook na-akpọnwụ akpọnwụ maọbụ ka ubi a gbara ogige nke mmiri kọrọ. 31Onye kachasị ike nʼetiti unu ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa na-ere ọkụ; ọrụ ya ga-abụ icheku ọkụ nke ga-emenye ọkụ ahụ ga-erepịa unu. Ọ dịkwaghị onye pụrụ imenyụ ya.” 2:1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem. 2Nʼụbọchị ikpeazụ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile, a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile, mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi. 3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 1:14–23

14Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche. 15Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị. 16Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche. 17Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa, 18ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 19Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ. 20Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.” 21Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 22Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” 23Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 1:20–33

20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ. Olu ya na-ada ụda nʼama. 21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku, nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile. 22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya? Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo? Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị? 23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu, aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu, aga m emekwa ka unu mara okwu m. 24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku, setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị, 25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị, jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu, 26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị. Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo. 27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike, mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe, mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya. 28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m. 29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị, unu atụghị egwu Onyenwe anyị. 30Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m. Unu lelịrị ịba mba m anya. 31Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ. 32Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha, ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi. 33Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi. Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 3 Maachị na kalenda nzukọ bụ 16 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike