Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 17 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 4 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 17 Maachị 2027
Wenezdee · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Venerable Gerasimus of the Jordan († 451)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa, “Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị, ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb. Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya niile, ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.” Iwu ga-esi na Zayọn pụta, okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta. 4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile, doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge; kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ. 5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị. 6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka. 7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo, ha bara ụba nke ukwuu. Ala ha jupụtara nʼịnyịnya. Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu. 8Ala ha jupụtara nʼarụsị, ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ, ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ. 9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala, meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala. Ya mere, agbagharala ha. 10Gaanụ nʼime nkume, zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya. 11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị. 25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” 27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha. 28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” 29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị. 30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.” 31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii. 2:1Otu a ka e si rụzuo ọrụ ike eluigwe na ụwa na ihe niile dị nʼime ha. 2Nʼụbọchị nke asaa, Chineke kwụsịrị ọrụ ya nke ọ na-arụ, o zukwara ike site nʼọrụ ya niile. 3Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile zobekwa iwu m niile nʼime obi gị, 2tọọ ntị gị nʼala nye amamihe, wepụta obi gị inwe nghọta. 3E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị, 4ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha maọbụ akụ nke zoro ezo, 5mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke. 6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa. 7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke. 8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso. 9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile. 10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ. 11Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche. 12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ, 13ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị, 14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ. 15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ. 16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu. 17Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke. 18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ. 19Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi. Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ. 20Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume, debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume, 21nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ, ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya. 22Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ, ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 4 Maachị na kalenda nzukọ bụ 17 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike