Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 16 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 16 Maachị 2027
Tiuzdee · Izu nke 5 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 5 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
4Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a. 5Ha kwuru okwu megide Chineke na Mosis sị, “Gịnị mere i ji site nʼala Ijipt kpọpụta anyị ka anyị nwụsịa nʼọzara a? Lee na nri ọbụla adịghị nʼebe a, mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa, ike iri mánà a na-enweghị isi agwụkwala anyị.” 6Ya mere, Onyenwe anyị zitere agwọ ọjọọ na-ata ata nʼetiti ha. Agwọ ndị a tagbukwara ọtụtụ nʼime ụmụ Izrel. 7Mgbe ahụ, ndị Izrel bịakwutere Mosis sị ya, “Anyị emehiela, nʼihi na anyị ekwuluola Onyenwe anyị, kwulukwaa gị onwe gị. Biko rịọrọ anyị Onyenwe anyị ka o wezugara anyị agwọ ọjọọ ndị a.” Mosis rịọrọ arịrịọ nʼihi ha. 8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpụọ otu agwọ yiri agwọ ndị a. Kwụba ya nʼọnụ ogologo osisi nke ị ga-amanye nʼala ebe mmadụ niile ga-ahụ ya anya. Onye ọbụla agwọ ọjọọ a tara ga-adị ndụ ma ọ bụrụ na ọ ga-ewelite anya ya elu lekwasị agwọ ahụ ị kwụbara nʼelu osisi ahụ.” 9Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị. Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. 2Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa. 15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 17Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 18Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị: 19“ Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, 20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.”
Oziọma
21Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.” 22Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?” 23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. 24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.” 25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. 26E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.” 27Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. 28Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. 29Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” 30Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike