Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 15 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 15 Maachị 2027

Mọnde · Izu nke 5 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 5 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 23:1–6

1Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke. 6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m ogologo ụbọchị niile nke ndụ m, m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe niile ebighị ebi.

Oziọma

Jọn 8:1–11

1Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv. 2Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. 3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. 4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” 6Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. 7Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” 8Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala. 9Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. 10Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?” 11Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike