Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 14 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 1 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Maachị 2027
Sọnde · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde chiiz. Nchụpụ Adam site na paradaịs
Sọnde Mgbaghara
Izu chiiz
Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Oziọma ofufe ụtụtụ nke 8
11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.
Akwụkwọ ozi
11Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. 12Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè. 13Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo. 14Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya. 14:1Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. 2Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. 3Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. 4Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
Oziọma
14Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mgbe ha mehiere megide unu, Nna unu nke bi nʼeluigwe ga-agbagharakwa unu mmehie unu. 15Ọ bụrụkwanụ na unu agbagharaghị ndị ọzọ mmehie niile ha, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu. 16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. 17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, 18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ. 19“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. 20Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe. 21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Maachị na kalenda nzukọ bụ 14 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike