Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 11 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 26 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 11 Maachị 2027

Tọọzdee · Izu chiiz · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke Izu chiiz

Izu chiiz

Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Jud 1:11–25

11Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora. 12Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ. 13Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. 14Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya. 15Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” 16Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha. 17Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu. 18Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. 19Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.” 20Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ. 21Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. 22Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere. 23Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị. 24Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ 25ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Oziọma

Luk 23:1–34, 44–56

1Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet. 2Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.” 3Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.” 4Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.” 5Ma ha gara nʼihu na-asị, “Ọ na-akpasu ọgbaaghara nʼala ndị Judịa niile site nʼozizi ya. Ọ malitere na Galili, ọ bịakwala ebe a ugbu a.” 6Mgbe Pailet nụrụ nke a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ bụ onye Galili? 7Mgbe ọ matara na o si nʼebe Herọd na-achị, o nyere iwu ka e dugara ya Herọd, onye nọkwa na Jerusalem mgbe ahụ. 8Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu, mgbe ọ hụrụ Jisọs nʼihi na ọ nọ na-achọ ịhụ ya anya nʼoge dị anya gara aga. Sitekwa nʼakụkọ ọ nụrụ banyere ya, o lere anya na ọ ga-arụ ọrụ ebube ụfọdụ. 9Ya mere ọ jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ zaghị ya ihe ọbụla. 10Ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu guzo nʼebe ahụ gara nʼihu bosie ya ebubo ike. 11Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet. 12Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro. 13Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ 14sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo. 15Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ. 16Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.” 17Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme. 18Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu nʼotu olu sị, “Gbuo nwoke a, hapụrụ anyị Barabas.” 19(Onye a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara dapụtara nʼobodo ahụ, nakwa nʼihi igbu mmadụ.) 20Dị ka ọ gbalịsịrị ike ịhapụ Jisọs, Pailet gwakwara ha okwu ọzọ. 21Ma ha niile tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 22Ọ sịrị ha na nke ugboro atọ, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? O nweghị ihe ọbụla m chọpụtara nʼaka ya kwesiri iwetara ya ọnwụ. Ya mere aga m ata ya ahụhụ, hapụ ya.” 23Ma ha nọgidere na-eti mkpu nʼoke olu ka a kpọgide ya nʼobe, nʼikpeazụ olu iti mkpu ha karịrị. 24Ya mere Pailet kpebiri imere ha ihe ha chọrọ. 25Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ nke a tụbara nʼụlọ mkpọrọ nʼihi ọgbaaghara na igbu mmadụ, ma nyefee ha Jisọs nʼaka. 26Dị ka ha duu ya na-aga, ha jidere Saimọn onye Sirini bụ onye si nʼime otu obodo nta na-alọbata; ha boro ya obe ahụ, manye ya ka o buru ya na-eso Jisọs na-azụ. 27Igwe mmadụ dị ukwuu soro ya tinyekwara ụmụ nwanyị bụ ndị tiri mkpu akwa ma ruokwara ya ụjụ. 28Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu. 29Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’ 30Mgbe ahụ, “ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’ 31Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?” 32Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya. 33Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi, ebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe ya na ndị ohi abụọ ahụ. Otu nʼaka nri ya nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 34Jisọs sịrị, “Nna gbaghara ha nʼihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” Ha ji ife nza kee uwe ya nʼetiti onwe ha. 44Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie. 45Nʼihi na anyanwụ kwụsịrị inye ihe ya. Akwa mgbochi dị nʼụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ. 46Jisọs tiri mkpu nʼoke olu sị, “Nna, nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” Mgbe o kwusiri nke a, o kubiri ume. 47Mgbe ọchịagha na-achị otu narị ndị agha hụrụ ihe merenụ, o nyere Chineke otuto ma kwuokwa sị, “Nʼezie nwoke a bụ onye ezi omume.” 48Mgbe igwe mmadụ niile gbakọtara ilere anya hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼụlọ ha na-eti aka nʼobi. 49Ma ndị niile maara onye ọ bụ, tinyekwara ụmụ nwanyị ndị soro ya si Galili bịa, guzokwara nʼebe dị anya na-ele ihe ndị a. 50O nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so nʼotu ndịisi ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezigbo mmadụ na onye aka ya kwụ ọtọ. 51Ọ kwadoghị mkpebi ha na omume ha. Onye sitere Arimatia, nʼotu obodo ndị Juu, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke. 52Nwoke a gakwuru Pailet rịọọ ka e bunye ya ahụ Jisọs. 53Ya mere, o budatara ya fụchie ya nʼakwa ọcha linin, tinye ya nʼili e gwuru nʼọgba nkume, nke a na-etinyebeghị mmadụ na mbụ. 54Ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe maka ụbọchị izuike nke na-abịa nso. 55Ndị nwanyị ahụ sitere Galili soro ya hụrụ ili ahụ, hụkwa otu e si nibe ahụ ya nʼime ya. 56Emesịa ha laghachiri ga kwadoo mmanụ otite nke e tinyere ọtụtụ ụda. Nʼụbọchị izuike ha zukwara ike dịka ọ dị nʼiwu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 26 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 11 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike