Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 10 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 25 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 10 Maachị 2027

Wenezdee · Izu chiiz · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke Izu chiiz

Izu chiiz

Ọ dịghị anụ; e kwere mmiri ara ehi, akwa na azụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Jul 2:12–26

12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ” 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya, nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ. 19Onyenwe anyị zaghachiri ha sị, “Ana m ezitere unu ọka na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, nke ga-ezuru unu, jukwa unu afọ. Agaghị m emekwa ka unu bụrụ ihe ịkwa emo nʼetiti ndị mba ọzọ. 20“Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche. 21Atụkwala egwu, gị ala Juda, kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ, nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya. 22Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju. 23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jul 3:12–21

12“Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na Ndagwurugwu Jehoshafat, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. 13Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” 14Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. 15Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè. 16Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn, olu ya ga-ada nʼime Jerusalem. Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị Izrel ebe e wusiri ike. 17“Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu bi na Zayọn, nʼugwu m dị nsọ. Jerusalem ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. 18“Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke Juda ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị sọpụta dee Ndagwurugwu Shitim. 19Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị Juda, bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. 20Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na Jerusalem nʼọgbọ niile. 21Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na Onyenwe anyị bi na Zayọn.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 10 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike